9Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
10Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.
11Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
12Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.
13“Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.