11Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
12Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.
13“Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.
14“Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ.
15Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma, hụ otu ala ya si maa mma, ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ; were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike.