8Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen.
9Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu.
10Mgbe ha ruru ebe ịzọcha ọka nke Atad, nʼofe ọzọ nke Jọdan, ha weere iti aka nʼobi dị ukwuu tie aka nʼobi ha nʼebe ahụ. Josef ruru ụjụ ụbọchị asaa maka nna ya nʼebe ahụ.
11Mgbe ndị bi nʼala Kenan hụrụ oke iru ụjụ nke ebe ịzọcha ọka nke Atad ahụ, ha sịrị, “Nke a bụụrụ ndị Ijipt iru ụjụ dị ukwuu.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ dị nso na Jọdan Ebel-Mizraim.
12Ụmụ Jekọb mere dịka nna ha gwara ha.