Jenesis 50

Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen.

Genesis 50:8 (UKJV) And all the house of Joseph, and his brethren, and his father's house: only their little ones, and their flocks, and their herds, they left in the land of Goshen.

6Fero zara sị ya, “Gaa lie nna gị dịka o mere ka ị ṅụọ iyi na ị ga-eme.”

7Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt.

8Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen.

9Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu.

10Mgbe ha ruru ebe ịzọcha ọka nke Atad, nʼofe ọzọ nke Jọdan, ha weere iti aka nʼobi dị ukwuu tie aka nʼobi ha nʼebe ahụ. Josef ruru ụjụ ụbọchị asaa maka nna ya nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.