Jenesis 9

Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya.

Genesis 9:21 (UKJV) And he drank of the wine, and was drunken; and he was uncovered within his tent.

19Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta.

20Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige.

21Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya.

22Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ.

23Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.