4Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.
5Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”?
6Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”
7O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”
8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ.