9“Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị, onye si nʼIjipt kpọpụta unu. Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ, dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka.
10A gwara m ndị amụma, ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche, sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche.”
11Gilead ọ na-eme ajọ ihe? Ndị ya bụ ndị efulefu. Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal? Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume, nke dị nʼubi a kọrọ akọ.
12Jekọb gbalagara nʼala Aram; Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye, nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.
13Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel, o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya.