11Gilead ọ na-eme ajọ ihe? Ndị ya bụ ndị efulefu. Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal? Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume, nke dị nʼubi a kọrọ akọ.
12Jekọb gbalagara nʼala Aram; Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye, nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.
13Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel, o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya.
14Ma Ifrem akpasuola iwe ilu nke ukwuu. Onyenwe ya ga-awụkwasịkwa ya ikpe ọmụma. Ọ ga-akwụghachi ya dịka nlelị ya si dị.