18Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. Aga m emebi ngwa agha niile, agha niile ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
19Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi; aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi, nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
20Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị. Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.
21“Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-azaghachi eluigwe, ha ga-azaghachi ala.
22Ala ga-azaghachi ọka na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv, mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.