16“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.
17Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya, ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.
18Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. Aga m emebi ngwa agha niile, agha niile ga-akwụsịkwa. Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.
19Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi; aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi, nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.
20Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị. Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.