14“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.
15“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’
16Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
17Ifrem na arụsị agbaala ndụ hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.
18Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ, ha na-aga nʼihu na-agba akwụna; ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.