16Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
17Ifrem na arụsị agbaala ndụ hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.
18Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ, ha na-aga nʼihu na-agba akwụna; ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.
19Ifufe ga-ebupụ ha, aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.