5Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha, Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha, Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ.
6Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha, gaa ịchọ Onyenwe anyị, ha agaghị achọta ya. Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.
7Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko. Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha ga-eripịa ha na ala ubi ha.
8“Fụọ opi ike na Gibea, fụkwaa mpi anụ na Rema. Tie mkpu agha na Bet-Aven. Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.
9A ga-ebibi Ifrem kpamkpam nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ. Nʼetiti ebo nke Izrel niile, ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.