3Ma Izrel ajụla ihe dị mma. Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ.
4Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase; ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị, ma ghara ịjụta ase nʼaka m. Ọlaọcha na ọlaedo ha ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị, nke ha ji ebibi onwe ha.
5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria. Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha. Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?
6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si. Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya; ọ bụghị Chineke. A ga-akụrisikwa nwa ehi Sameria ahụ.
7“Ha akụọla ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha na-eguzo na-enweghị okpo ọka ọbụla. A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ, ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.