5Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria. Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha. Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha?
6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si. Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya; ọ bụghị Chineke. A ga-akụrisikwa nwa ehi Sameria ahụ.
7“Ha akụọla ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha na-eguzo na-enweghị okpo ọka ọbụla. A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ, ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.
8Elodala Izrel! Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ dịka mkpọkọrọ ite.
9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.