6Ọ bụ nʼIzrel ka ha si. Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya; ọ bụghị Chineke. A ga-akụrisikwa nwa ehi Sameria ahụ.
7“Ha akụọla ifufe, ha ga-aghọtakwa oke ifufe. Osisi ọka ha na-eguzo na-enweghị okpo ọka ọbụla. A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ, ndị mba ọzọ ga-atapịa ya.
8Elodala Izrel! Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ dịka mkpọkọrọ ite.
9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.
10Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, aga m achịkọta ha. Ha ga-atakwa ahụ nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.