Hosiya 8

Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, aga m achịkọta ha. Ha ga-atakwa ahụ nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.

Hosea 8:10 (UKJV) Yea, though they have hired among the nations, now will I gather them, and they shall sorrow a little for the burden of the king of princes.

8Elodala Izrel! Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ dịka mkpọkọrọ ite.

9Nʼihi na ha ejeela Asịrịa dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya.

10Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, aga m achịkọta ha. Ha ga-atakwa ahụ nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha.

11“Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie, ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie.

12E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m, ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.