1Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel, ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ, nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya nʼelu ebe ịzọcha ọka niile.
2Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri, mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha.
3Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị, ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ.
4Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị, nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ. Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị. Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha, ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
5Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị?