10Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị, alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.
11Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ”
12Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya.
13Nʼihi na ọ na-asị, “ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a, ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta. Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche, apụnara m ha akụ ha niile; dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.
14Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ”