Aịzaya 10

Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.

Isaiah 10:17 (UKJV) And the light of Israel shall be for a fire, and his Holy One for a flame: and it shall burn and devour his thorns and his briers in one day;

15Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ, ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe? Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu, maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi.

16Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere.

17Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.

18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.

19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.