Aịzaya 10

A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.

Isaiah 10:18 (UKJV) And shall consume the glory of his forest, and of his fruitful field, both soul and body: and they shall be as when a standard-bearer faints.

16Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere.

17Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.

18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.

19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.

20Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.