17Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.
18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.
19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.
20Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.
21Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.