Aịzaya 10

Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.

Isaiah 10:31 (UKJV) Madmenah is removed; the inhabitants of Gebim gather themselves to flee.

29Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ.

30Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!

31Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.

32Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.

33Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.