Aịzaya 10

Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.

Isaiah 10:32 (UKJV) As yet shall he remain at Nob that day: he shall shake his hand against the mount of the daughter of Zion, the hill of Jerusalem.

30Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot!

31Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.

32Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.

33Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.

34Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa. Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.