Aịzaya 10

Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’

Isaiah 10:8 (UKJV) For he says, Are not my princes altogether kings?

6Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke, m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe, ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike, nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ.

7Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere, nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya; o zubere ịla ndị m nʼiyi, na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.

8Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’

9‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish? Hamat ọ dịghị ka Apad; Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs?

10Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị, alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.