7Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere, nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya; o zubere ịla ndị m nʼiyi, na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche.
8Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
9‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish? Hamat ọ dịghị ka Apad; Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs?
10Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị, alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.
11Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ”