Aịzaya 14

Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ.

Isaiah 14:15 (UKJV) Yet you shall be brought down to hell, to the sides of the pit.

13Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu.

14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”

15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ.

16Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ.

17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.