14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”
15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ.
16Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ.
17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”
18Ndị eze mba niile dị iche iche na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha.