26Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile; nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.
27Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya? O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ?
28Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ:
29Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia, maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela; Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala, mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile.
30Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri, ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo. Ma aga m eji agụụ na ụnwụ laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi.