1Ma Onyenwe anyị ga-emekwara Jekọb ebere; ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ, meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha. Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha, soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ.
2Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha, nke Onyenwe anyị nyere ha. Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel, ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị. Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ, ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga.
3Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu,
4unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị. Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ. Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa!
5Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe, meekwa ka mkpara ndị na-achị achị,