Aịzaya 14

unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị. Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ. Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa!

Isaiah 14:4 (UKJV) That you shall take up this proverb against the king of Babylon, and say, How has the oppressor ceased! the golden city ceased!

2Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha, nke Onyenwe anyị nyere ha. Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel, ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị. Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ, ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga.

3Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu,

4unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị. Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ. Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa!

5Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe, meekwa ka mkpara ndị na-achị achị,

6nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ na-esepụghị aka nʼiti ha ihe, nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.