Aịzaya 15

Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.

Isaiah 15:6 (UKJV) For the waters of Nimrim shall be desolate: for the hay is withered away, the grass fails, there is no green thing.

4Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.

5Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab, ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit. Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.

6Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.

7Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.

8Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile; akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim; abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.