5Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab, ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit. Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.
6Mmiri Nimrim atachaala! Ahịhịa akpọnwụọkwala; ahịhịa ndụ niile agwụkwala o nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.
7Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwara ka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.
8Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile; akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim; abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.
9Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara, ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn! Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab gbapụrụ tụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.