1Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye nye onye na-achị ala ahụ site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara ruo ugwu nke Ada Zayọn.
2Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.
3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.