7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri.
9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale, nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.
11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.