10Gaanụ nʼime nkume, zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
11Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala. Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
12Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, nʼihi na ihe niile e buliri elu (ka a ga-eweda nʼala),
13nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn, na osisi ook niile nke Bashan,
14nye ugwu ukwu niile nke dị elu, na ugwu nta niile e buliri elu,