12Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, nʼihi na ihe niile e buliri elu (ka a ga-eweda nʼala),
13nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn, na osisi ook niile nke Bashan,
14nye ugwu ukwu niile nke dị elu, na ugwu nta niile e buliri elu,
15nye ụlọ elu niile, na mgbidi niile e wusiri ike,
16nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.