15nye ụlọ elu niile, na mgbidi niile e wusiri ike,
16nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
17Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.