Aịzaya 2

Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.

Isaiah 2:20 (UKJV) In that day a man shall cast his idols of silver, and his idols of gold, which they made each one for himself to worship, to the moles and to the bats;

18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.

19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.

20Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.

21Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.

22Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi. O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime, nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.