11Nke a bụ amụma megide Duma: Otu onye si na Sia na-akpọ m oku, “Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ? Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?”
12Onye nche zara sị, “Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ, ma laghachikwa ọzọ.”
13Amụma megide Arebịa: Unu ndị ije niile nke Dedan, ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa,
14kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ; unu ndị bi nʼala Tema, buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri.
15Nʼihi na ọ bụ site nʼagha nke e ji mma agha egbu ndị mmadụ, na agha e ji akụ agbatu mmadụ ka ha si na-agbapụ ọsọ.