6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.
7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.”
8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị, “Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche, nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile.
9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa, ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ. O nyeghachiri ọsịsa ahụ, ‘Babilọn adaala, e ọ daala, arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ”
10O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka, agwala m unu ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru.