5Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ!
6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.
7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.”
8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị, “Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche, nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile.
9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa, ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ. O nyeghachiri ọsịsa ahụ, ‘Babilọn adaala, e ọ daala, arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ”