Aịzaya 21

Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ!

Isaiah 21:5 (UKJV) Prepare the table, watch in the watchtower, eat, drink: arise, all of you princes, and anoint the shield.

3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.

4Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji.

5Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ!

6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.

7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.