Aịzaya 21

Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji.

Isaiah 21:4 (UKJV) My heart panted, fearfulness affrighted me: the night of my pleasure has he turned into fear unto me.

2Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi, na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo. Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu! Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.

3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.

4Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji.

5Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ!

6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.