Aịzaya 21

Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.

Isaiah 21:3 (UKJV) Therefore are my loins filled with pain: pangs have taken hold upon me, as the pangs of a woman that labors: I was bowed down at the hearing of it; I was dismayed at the seeing of it.

1Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri: Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga, ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa, site nʼala nke oke egwu.

2Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi, na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo. Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu! Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.

3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.

4Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji.

5Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.