3Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu, ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa, owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa, ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.
4Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”
5Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt, ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.
6Gabiganụ ruo Tashish tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.
7Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile? Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga? Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?