1Nke a bụ amụma megide Taịa: Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish nʼihi na e bibiela Taịa, ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata. Ozi erutela ha aka site nʼobodo Saiprọs.
2Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu. Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn, ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa.
3Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu, ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa, owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa, ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.
4Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”
5Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt, ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.