5Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt, ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.
6Gabiganụ ruo Tashish tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.
7Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile? Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga? Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?
8Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa, bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze, mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze, nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?
9Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya, nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile, na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.