7Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile? Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga? Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?
8Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa, bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze, mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze, nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?
9Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya, nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile, na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.
10Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl, unu ụmụada Tashish, nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.
11Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri mee ka alaeze ha niile maa jijiji. O nyela iwu banyere Fonisia ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.