Aịzaya 25

Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe; mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ; meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi, agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi.

Isaiah 25:2 (UKJV) For you have made of a city an heap; of a defenced city a ruin: a palace of strangers to be no city; it shall never be built.

1O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m; aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto, nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke, ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama, nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.

2Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe; mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ; meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi, agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi.

3Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị. Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu.

4Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba; ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha, ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo, na ndo nʼoge okpomọkụ. Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.